Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 11:5 - Bible Nso

5 umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt gānwu kwa, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke n-anọkwasi n'oche-eze-ya, we rue nwa o buru uzọ mu, bú nwayi nēje ozi nke nọ n'azu nkume-igwe-nri; na umu nile anumanu buru uzọ mu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 11:5
13 Iomraidhean Croise  

O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.


Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt, Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.


Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:


O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt, Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:


M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.


O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.


o rue, mb͕e Fero mere ka o sie ike, bú izipu ayi, na Jehova b͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma nwa madu buru uzọ mu, ma nwa anumanu buru uzọ mu: n'ihi nka ka mu onwem nēwere nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú oké, chuara Jehova àjà; ma ọkpara ọ bula nke umum, anamab͕aputa ya.


M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.


Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.


Umu-okorọbia buru nkume-igwe-nri, Umu-okoro su-kwa-ra ngọngọ n'okpuru nkú.


ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù.


Okwukwe ka o ji me ememe ngabiga ahu, ya na nwusa ọbara ahu, ka onye ahu nēbibi umu eburu uzọ mu we ghara imetu ha aka.


Ndi Filistia we jide ya, rukpọ anya-ya abua; ha we me ka ọ ridarue Geza, were ihe ọla abua ke ya ab͕u; o we buru onye nēgwe ọka n'ulo ndi ekere ab͕u.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan