Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 10:5 - Bible Nso

5 ha gēkpuchi kwa iru ala, madu agaghi-enwe kwa ike ihu ala anya: ha gēri kwa ihe fọduru nke ihe arapuworo, nke fọduru unu site n'ákú-miri-ígwé, ha gēri kwa osisi nile ọ bula nke nēpuru unu epú site n'ọhia:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 10:5
7 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu ala Ijipt iweta igurube, ka ha we rigota n'elu ala Ijipt, rie-ihe-ọkukú ọ bula nke ala, bú ihe nile nke ákú-miri-ígwé ahu rapuru.


Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n'osisi ma-ọbu n'ihe-ọkukú nke ubi, n'ala Ijipt nile.


N'ihi na, ma ọ buru na i nāju izipu ndim, le, echi ka M'gaje ime ka igurube bata n'ókè-ala-gi:


Ma etighi ọka wheat na ọka spelt: n'ihi na ihe ahu etoghi.


Ihe palmer-worm rifọworo ka igurube riworo; ihe igurube rifọworo ka ukpala riworo; ihe ukpala rifọworo ka ọbubu riworo.


M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu.


N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan