M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a.
Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim.
Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije: