Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 10:22 - Bible Nso

22 Moses we setipu aka-ya n'iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n'ala Ijipt nile ubọchi atọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 10:22
13 Iomraidhean Croise  

N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.


O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.


Ndi Israel we guzo n'ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ.


ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.


Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.


Ihe nile nke nēnye ìhè n'elu-igwe ka M'gēme ka ha jie nji n'elu gi, M'gētiyekwasi kwa ọchichiri n'ala-gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


ọ bu ubọchi ọchichiri na oké nb͕achi, ubọchi igwe-oji na oké ọchichiri, dika chi-ọbubọ nke bọsaworo n'elu ugwu nile; otù ndi nābia di ọtutu nwe kwa ume, ihe di ka ha adighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, mb͕e ha gasiri ihe di ka ha agaghi-adi ọzọ, rue arọ nile nke ọb͕ọ na ọb͕ọ.


Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, tutu ubọchi Jehova abia, bú ubọchi ahu di uku di kwa egwu.


N'ihi na, le, Onye nākpu ugwu nile, Nke nēkè kwa ifufe, Nke nēgosi kwa madu ihe bu ntughari-uche-ya, Onye nēme chi-ọbubọ ka ọ b͕a oké ọchichiri, Nke nāzọkwasi kwa ebe nile di elu nke uwa; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bu aha-Ya.


Ọzọ kwa, Mu onwem eb͕ochiworo unu oké miri-ozuzo, mb͕e ọnwa atọ fọduru iru mb͕e owuwe-ihe-ubi: eme-kwa-ram ka o zokwasi otù obodo, ma adighm-eme ka o zokwasi obodo ọzọ: otù òkè ala-ubi ka o nēzokwasi, ma òkè ala-ubi ahu nke ọ nādighi-ezokwasi nākpọnwu akpọnwu.


Unu we biaru nso, guzo n'okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n'ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri.


Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.


Mọ-ozi nke-ise we wusi ọkwa-ya n'elu oche-eze nke anu-ọhia ahu; ewe me ka ala-eze-ya b͕a ọchichiri; ha we tabìe ire-ha site n'aru-ufu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan