Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 10:2 - Bible Nso

2 ka i we kọ kwa na nti nwa-gi na nwa nwa-gi akukọ bayere emò M'kwara ndi Ijipt, na ihe-iriba-ama nile nke M'tiyere n'etiti ha; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 10:2
22 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.


Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.


Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.


Madu gāsi kwa, N'ezie nkpuru diri onye ezi omume: N'ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n'uwa.


Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.


Nke ayi nuworo mara kwa, Nke nna-ayi-hà kọwo-kwa-ra ayi.


O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta:


Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e agāsọpurum n'aru Fero, na n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.


M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a.


Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.


Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta.


Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt.


Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi.


M'we merua ha n'onyinye nile ha, n'ime ka nwa ọ bula nke nēmeghe àkpà-nwa mbu gabiga n'ọku, ka M'we me ka ha tọb͕ọrọ n'efu, ka ha we mara na Mu onwem bu Jehova.


N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.


Kọrọnu ya umu-unu, ka umu-unu kọ-kwa-ra umu-ha, ka umu-ha kọ-kwa-ra ọb͕ọ ọzọ.


Ndi bu nna, akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùputa ha n'ọzùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi.


Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan