6 Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile.
6 Emesịa, Josef na ụmụnne ya niile nwụrụ, ma ọgbọ ahụ niile nwụkwara.
Josef we si umu-nne-ya, Mu onwem gaje inwu: ma Chineke gēleta unu n'ezie, me ka unu si n'ala nka rigorue ala ahu nke Ọ ṅuru Abraham na Aisak iyi bayere ya.
Josef we nwua, ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri: ha we b͕asì ozu-ya etiye ya n'ib͕e n'Ijipt.
Otù ọgbọ alá, ọb͕ọ ọzọ abia; ma uwa nēguzoru mb͕e ebighi-ebi.
Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.