Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 1:10 - Bible Nso

10 ngwa, ka ayi gosi onwe-ayi na ndi mara ihe n'ebe ha nọ; ka ha we ghara iba uba, o we rue, mb͕e agha gāda n'ala-ayi, na ha gētiyekọta onwe-ha n'aru ndi nākpọ ayi asì, ha we buo agha megide ayi, si n'ala nka rigopua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ngwanụ, ka anyị were amamihe meso ha mmeso ọjọọ, ma ọ bụghị otu a, ha ga-amụba karịa, mgbe agha ga-adapụta nʼetiti anyị na ndị iro anyị, ha ga-esoro ndị iro anyị lụso anyị agha, site nʼala a gbapụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 1:10
13 Iomraidhean Croise  

Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.


Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère.


Ọ b͕anwere obi-ha ikpọ ndi-Ya asì, Ib͕agide ndi-orù-Ya ìzù ọjọ.


Ọ buru na ha asi, Soro ayi je, Ka ayi che anwu ọbara, Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;


Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


ma ub͕u a, biko, bia, buaram ndi nka ọnu; n'ihi na ndi di ike ka ọ bu karim: eleghi anya m'gēnwe ike, ka ayi we tib͕ue ha, m'we chupu ha n'ala: n'ihi na amawom na onye i nāgọzi bu onye agọziri agọzi, ma onye i nābu ọnu bu onye anābu ọnu.


Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl.


Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.


Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan