Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 9:8 - Bible Nso

8 Moses we si ha, Guzonu; ka m'we nu ihe Jehova gēnye n'iwu bayere unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta Onyenwe anyị ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 9:8
19 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.


Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.


M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.


Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase:


I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.


Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, ka ewe kọrọ ha ala okwu ahu n'ọnu Jehova.


Ha we me ka ọ nọdu n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ, n'ihi na agwaghi ha ihe banyere ya, bú ihe agēme ya.


Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova.


ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi bu ndi ruru árú site n'ozu madu: n'ihi gini ka anēb͕ochi ayi ka ayi we ghara iweta nso onyinye iji biaru nso Jehova na mb͕e-ya akara àkà n'etiti umu Israel?


Jehova we gwa Moses okwu, si,


n'ihi na okwu I nyerem ka M'nyeworo ha; ha onwe-ha we nara ha, mara kwa n'ezie na esim n'ebe I nọ puta, ha kwere kwa na Gi onwe-gi ziterem.


Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem.


N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.


N'ihi na mu onwem natara n'aka Onye-nwe-ayi ihe m'nye-kwa-ra unu n'aka idebe, na Onye-nwe-ayi Jisus n'abali ahu nke arara Ya nye n'aka madu, Ọ nara ob͕e achicha,


N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan