Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 9:5 - Bible Nso

5 Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 9:5
18 Iomraidhean Croise  

Noa we me ya; dika iwu nile si di nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.


Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.


Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.


Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere.


Dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile.


Umu Israel we me otú a; dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mere.


Moses we gwa umu Israel okwu dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di.


Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha.


Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.


Site n'ihe ndia, eze Agripa, abughm onye nādighi-ekweye ọhù ahu nke elu-igwe:


O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di;


Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.


Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.


Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;


Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan