Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka.
N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya.
Ha we me ememe ngabiga ahu n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, n'etiti ehihie na anyasi, n'ọzara Sainai: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka umu Israel mere.