Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 9:15 - Bible Nso

15 N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 9:15
21 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.


ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.


Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali.


O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.


Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali:


ogidi igwe-oji ahu n'ehihie, na ogidi ọku ahu n'abali, adighi-apu n'iru ndi Israel.


O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt.


N'ubọchi mbu nke ọnwa mbu ka i gēguzo ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu ọtọ.


Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu.


Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu.


N'ihi na igwe-oji nke Jehova di n'elu ebe-obibi ahu n'ehihie, ọku di kwa nime ya n'abali, n'anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.


Jehova gēkè kwa n'elu ebe ahu nile guzosiri ike nke ugwu Zaion, na n'elu nkpọkọta-ya nile, igwe-oji na anwuru-ọku n'ehihie, na onwunwu nke ọku nēre ere n'abali: n'ihi na n'elu ebube nile ka agāb͕asa ihe-nkpuchi.


Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.


ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali.


Moses we do nkpa-n'aka nile n'iru Jehova n'ulo-ikwū nke ihe-àmà.


N'ihi na achọghm, umu-nnam, ka unu ghara imara, na nna-ayi-hà nile nọri n'okpuru igwe-oji ahu, ha nile gabiga-kwa-ra oké osimiri ahu;


Onye nēje n'iru unu n'uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n'ọku n'abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n'igwé-oji ahu n'ehihie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan