Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.
Ọ gānọdu kwa ala dika onye-nnucha ọla-ọcha nke nēme ka ọ di ọcha, Ọ gēme kwa ka umu Livai di ọcha, sicha kwa ha dika ọla-edo na ọla-ọcha; ha ganēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma n'ezi omume.