Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were ndi Livai n'ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n'etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere:
N'ihi na Mu nwe umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, ma n'etiti mmadu ma n'etiti anu-ulo: n'ubọchi m'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro ha nsọ nye Onwem.
Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.