Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 7:19 - Bible Nso

19 o wetara nso onyinye-ya iji biaru nso: otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 7:19
10 Iomraidhean Croise  

Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete;


I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha.


Ite nile kwa, na osekè nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe ọla nile nke ha ji eje ozi, ndia ka ha chipuru.


Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.


N'ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n'elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n'ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n'iru ebe-ichu-àjà.


N'ubọchi nke-abua Netanel nwa Zua, onye-isi Isaka, wetara ihe-ya nso:


na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ;


Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.


O were ọsọ bata ngwa ngwa n'ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa ub͕u a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan