Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 7:13 - Bible Nso

13 onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 7:13
23 Iomraidhean Croise  

na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;


na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.


m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri:


I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha.


Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah:) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova.


O me-kwa-ra ihe nile nke di n'elu table, bú afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka ha bu.


Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.


Belshaza, mb͕e ọ nēdetu manya-vine ahu ire, ọ siri ka achita iko ọla-edo na ọla-ọcha nke Nebukadneza, bú nna-ya, chiputarari n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem; ka eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-enyi-ya nwanyi we ṅua manya-vine nime ha.


Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


Ọ̀rùrù-ọnu-gi nile gādi kwa ka shekel nke ebe nsọ si di: orú gerah gābu shekel ahu.


Ọgugu ọnu gi gābu kwa nke nwoke site n'onye b͕ara orú arọ we rue onye b͕ara ọgu aro atọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa ọgu shekel ọla ọcha abua na iri, dika shekel nke ebe nsọm si di.


N'ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n'elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n'ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n'iru ebe-ichu-àjà.


onye ahu nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso gēweta kwa nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma, bú otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu:


na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu ka ọ buru onyinye-inata-iru-oma.


nāgughi àjà-nsure-ọku ọnwa ọhu, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, dika ikpé-ha si di, ibu ihe isì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.


n'aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n'isi n'isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah):


Onye nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso n'ubọchi mbu bu Nahshon nwa Aminadab, nke ebo Juda:


na otù ngaji ọla-edo nke di shekel iri n'ọtùtù, juputara n'ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ;


onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọlaọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;


Ewe bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu: o we būru ya nye nne-ya.


Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan