Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 6:20 - Bible Nso

20 onye-nchu-àjà gēfé kwa ha ibu àjà-ofufé n'iru Jehova; ihe nsọ ka ọ buru onye-nchu-àjà, tiyere okpukpu-obi nke àjà-ofufé, tiye-kwa-ra utaku-ukwu nke àjà-nbuli: emesia onye-Nazirait ahu gāṅu manya-vine.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Onye nchụaja ahụ nʼoge a, ga-ewere aja ndị a fufee ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Ha niile ga-abụ ihe nsọ nye onye nchụaja ahụ, tinyere obi anụ ahụ e fufere efufe, na apata anụ ahụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ doro onwe ya nsọ nwere onwe ya ịṅụ mmanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 6:20
24 Iomraidhean Croise  

Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.


Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.


ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.


Utaku-ukwu nke àjà-nbuli na okpukpu-obi nke àjà-ofufé ka ha gēweta n'elu àjà-ọku nile nke abuba nile, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa nke gí, na nke umu-gi ndikom tiyere gi, dika òkè-unu ebighi-ebi; dika Jehova nyere iwu.


ọ gēfé kwa ùkwù ahu n'iru Jehova, ka unu we buru ihe nātọ utọ: n'echi nke ubọchi-izu-ike ahu ka onye-nchu-àjà gēfé ya.


aka ya gēweta àjà-ọku nke Jehova; abuba di n'akuku okpukpu-obi ka ọ gēweta, ya na okpukpu-obi, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēsure kwa abuba ahu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísi utọ n'ebe-ichu-àjà: ma okpukpu-obi ahu ka Eron na umu-ya ndikom gēnwe.


Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n'ihe àjà nile nke àjà-udo-unu.


N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel.


ma okpukpu-obi-ha na utaku-ukwu aka-nri ka Eron fere ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; dika Moses nyere iwu.


Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.


N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.


Anu-ha bu kwa nke gi, dika okpukpu-obi nke àjà-ofufé, na dika utaku-ukwu aka-nri, nke gi ka ọ bu.


Onye-nchu-àjà gānara kwa onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo n'aka nwayi ahu, fé onyinye-inata-iru-ọma ahu n'iru Jehova, weta ya nso ebe-ichu-àjà:


Nka bu iwu onye-Nazirait onye nēkwe nkwa, na nke onyinye-ya iji biarue Jehova nso bayere nkewaputa-ya, nāgughi ihe aka-ya gēru: dika nkwa-ya si di, nke ọ nekwe, otú a ka ọ gēme n'iwu nkewaputa-ya.


Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam.


N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke.


Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan