Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 6:15 - Bible Nso

15 na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 6:15
15 Iomraidhean Croise  

na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.


kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Ebipuwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Jehova; ndi-nchu-àjà, bú ndi nējere Jehova ozi, eruwo újú.


Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.


Ma mb͕e i gēweta nso onyinye iji biaru nso, bú onyinye-inata-iru-ọma esiri n'ite-ọku, ọ gābu ob͕e achicha ekoghi-eko nke utu ọka flour agwara manu, ma-ọbu mbadamba-achicha ekoghi-eko nke etere manu.


Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.


Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;


chiri kwa ehi na ebulu ka ha buru àjà-udo, ichu n'iru Jehova; were kwa onyinye-inata-iru-ọma agwara manu: n'ihi na ta ka Jehova gēme ka unu hu Ya anya.


Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.


Onye-nchu-àjà gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, me àjà-nmehie-ya, na àjà-nsure-ọku-ya:


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


N'ihi na mb͕e ọ bula unu nēri achicha nka, nāṅu kwa iko ahu, unu nēkwusa ọnwu Onye-nwe-ayi rue mb͕e Ọ gābia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan