Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 5:26 - Bible Nso

26 onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu weju nweju-aka-ya, ka ọ buru ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, emesia ọ gēme ka nwayi ahu ṅua miri ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Onye nchụaja ga-esite nʼonyinye mkpụrụ ahụ kporo nke ga-eju ya aka, nke na-anọchite anya ha niile, suo ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Emesịa, ọ ga-enye nwanyị ahụ mmiri ahụ ka ọ ṅụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 5:26
5 Iomraidhean Croise  

ọ gēweta-kwa-ra umu-ndikom Eron ya, bú ndi-nchu-àjà: o gēsi nime ya weju nweju-aka-ya sitere n'utu ọka flour-ya, site kwa na manu-ya, tiyere frankincense nke ya nile; onye-nchu-àjà gēsure kwa ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova:


Onye-nchu-àjà gēsi kwa n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bulie ihe-ncheta-ya, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Ọ gēweta-kwa-ra ya onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gēweju kwa nweju-aka-ya site na ya ibu ihe-ncheta-ya, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.


O gēsite nime ya weju nweju-aka-ya weli, bú site n'utu ọka flour nke onyinye-inata-iru-ọma, site kwa na manu-ya, weli kwa frankincense nile nke di n'elu onyinye-inata-iru-ọma ahu, o gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà ka ọ buru ihe ísì utọ, dika ihe-ncheta-ya, anēsurere Jehova.


Onye-nchu-àjà gānara kwa onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo n'aka nwayi ahu, fé onyinye-inata-iru-ọma ahu n'iru Jehova, weta ya nso ebe-ichu-àjà:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan