Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 5:23 - Bible Nso

23 Onye-nchu-àjà gēde kwa ọb͕ub͕a-iyi ndia n'akwukwọ, o gēhichapu kwa ha nime miri ilu ahu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 “ ‘Mgbe ahụ onye nchụaja ahụ ga-ede ọbụbụ ọnụ ndị a nʼakwụkwọ, sanye ha nʼime mmiri ilu ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 5:23
14 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú nkọcha nile nke edeworo n'akwukwọ ahu nke ha guworo n'iru eze Juda:


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti! (Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;) Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!


Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.


Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile.


Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


Ehichapuwom njehie-gi nile, dika oké igwe-oji, hichapu kwa nmehie-gi nile, dika igwe-oji: Iaghachikutem; n'ihi na ab͕aputawom i.


miri a nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa na ngiri-afọ-gi, ime ka afọ-gi za aza, na ime ka apata-ukwu-gi bua aru: nwayi ahu gāsi kwa, Amen, Amen.


ọ gēme kwa ka nwayi ahu ṅua miri ilu nke nēweta ọbubu-ọnu: miri ahu nke nēweta ọbubu-ọnu gābà kwa nime ya ighọ ihe-ilu.


Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a;


Ma ub͕u a, Derenu onwe-unu abù a, gi zí kwa ya umu Israel: tiye ya n'ọnu-ha, ka abù a we burum ihe-àmà megide umu Israel.


M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan