Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 5:15 - Bible Nso

15 nwoke ahu gēme kwa ka nwunye-ya biakute onye-nchu-àjà, ọ gēweta kwa n'ihi nwunye-ya onyinye-ya iji biaru nso, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka barley; ọ gaghi-awukwasi ya manu, ọ gaghi-atukwasa ya frankincense; n'ihi na onyinye-inata-iru-ọma nke ekworo ka ọ bu, bú onyinye-inata-iruọma nke ihe-ncheta, nēme ka echeta ajọ omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 nwoke a ga-akpọrọ nwunye ya bịakwute onye nchụaja. Ọ ga-eweta onyinye iji ịbịaru nso nʼihi nwunye ya, nke bụ iko ụtụ ọka balị abụọ a na-awụkwasịghị mmanụ, maọbụ ụda na-esi isi ụtọ a gwakọrọ agwakọ, nʼihi na ọ bụ onyinye mkpụrụ ọka e sitere nʼobi jupụtara nʼekworo nye, onyinye ịkpọtụ uche nʼikpe ọmụma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 5:15
9 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Ọ gādi-kwa-ra ha ka ọjuju-ase efu n'anya-ha, bú ndi ṅuworo ha iyi di iche iche: ma ya onwe-ya nēme ka echeta ajọ omume, ka ewe jide ha.


Ọ gaghi-abu-kwa-ra ulo Israel ihe-ntukwasi-obi nēme ka echeta ajọ omume, mb͕e ha nēche iru ile ha anya n'azu: ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.


M'we were ego ọla-ọcha iri na ise, na otù homer ọka barley, na nkera homer ọka barley, gotara ya onwem:


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n'etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n'etiti anu-ulo, n'etiti ìgwè ehi na n'etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso.


Ma mb͕e madu gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú onyinye anēnye Jehova inata iru-ọma, utu ọka flour ka onyinye-ya iji biaru nso gābu; ọ gāwukwasi ya manu, tiye kwa frankincense n'elu ya:


Ma ọ buru na aka-ya erughi na nduru abua ma-ọbu n'umu-kpalakwu-kwu abua, ọ gēweta kwa onyinye-ya iji biaru nso, bayere nmehie nke ọ mehie-woro, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ephah utu ọka flour ka ọ buru àjà-nmehie; ọ gaghi-atukwasi ya manu, ọ gaghi-etiye kwa frankincense n'elu ya: n'ihi na àjà-nmehie ka ọ bu.


Onye-nchu-àjà gēme kwa ka ọ biarue nso, guzo ya n'iru Jehova:


Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan