Ewe gua ndi Livai ọnu site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru: ọnu-ọgugu-ha, onye na isi-ya onye na isi-ya, ndikom di ike, di orú nnù uzọ anọ na nnù iri-na-ise.
Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.
site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābà ifè òfùfè, na òfùfè nke ibu n'ulo-ikwū nzute,