Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 4:32 - Bible Nso

32 na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 4:32
12 Iomraidhean Croise  

Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche.


Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.


I gēme kwa ogige ebe-obibi ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida gēnwe ákwà-ngechi igechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo gādiri otù akuku ahu:


Ukwu nile nke ide ahu nwere bu ọla; nkpọye nile nke ide na ngegide nile ha bu ọla-ọcha; ihe amachitara isi-ha bu kwa ọla-ọcha; ihe ahu bu kwa ihe egegidere ngegide ọla-ọcha, bú ide nile nke ogige ahu.


Ndia bu ngukọta ihe ebe-obibi ahu, bú ebe-obibi nke ihe-àmà ahu, dika agukọtara ha, n'okwu-ọnu Moses, ọ bu òfùfè nke ndi Livai, site n'aka Itama, bú nwa Eron onye-nchu-àjà.


Nlekọta nke ihe-ndebe nke umu Merari bu ibo nile nke ebe-obibi ahu, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na akwa ya nile, na ihe-ya nile, na òfùfè-ya nile:


Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.


Nka bu kwa ihe-ndebe nke ibu-ha, dika òfùfè-ha nile si di n'ulo-ikwū nzute; ibo nile nke ebe-obibim, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;


Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n'ulo-ikwū nzute, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.


N'okwu-ọnu Jehova ka agukọtara ha n'aka Moses, nwoke ọ bula dika ibu-ya si di: bú ndi-ya agukọtara agukọta, dika Jehova nyere Moses iwu.


O rue, n'ubọchi Moses guzosiri ebe-obibi ahu, te ya manu, do ya nsọ, na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, mb͕e ọ tesiri ha manu, do ha nsọ;


ugbala anọ na ehi asatọ ka o nye-kwa-ra umu Merari, dika òfùfè-ha si di, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan