Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 4:12 - Bible Nso

12 ha gēwere kwa ihe nile nke ije-ozi ahu, nke ha ji je ozi n'ebe nsọ ahu, tiye ha nime ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ha, tukwasi ha n'ihe eji bū ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 4:12
16 Iomraidhean Croise  

Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha.


Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche.


Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Chineke:


Na ite nile, na osekè nile, na ndudu nile, na ihe-ha nile, ndia ka Huram nna-ya mere eze, bú Solomon, bayere ulo Jehova, ha bu ọla echichara echicha.


Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ha;


na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma: ọnu-uzọ ulo ahu kwa, ibo-ọnu-uzọ ime-ime ya nile nke diri ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo ahu, bú ulo uku Chineke, bu ọla-edo.


na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;


Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.


na uwe nile akpara nke ọma, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-aja, nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà;


Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.


Ọ bu kwa n'elu ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, were kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal kpuchie ya, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime:


Ha gēkpopu kwa ntu n'ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n'elu ya ákwa ododo:


tiye kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya, b͕akwasi kwa ákwà anunu anunu n'elu, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime


N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya:


Ha gēwere kwa ákwà anunu, kpuchie ihe-idọba-oriọna nke ihe ahu nēnye ìhè, na oriọna-ya nile, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, na ihe-manu-ya nile, nke ha were jere ya ozi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan