Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n'obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M'tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M'nyeworo gi n'iwu:
Ma ha gābu ndi nēje ozi n'ebe nsọm, ndi-nlekọta n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo nkem, nēje kwa ozi n'ulo ahu: ha onwe-ha gēb͕uru ndim anu àjà-nsure-ọku-ha na nke àjà ọzọ ha, ha onwe-ha gēguzo kwa n'iru ha ijere ha ozi.
Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.