Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 35:8 - Bible Nso

8 Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n'ihe-onwunwe nke umu Israel, n'aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n'aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n'obodo-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 35:8
11 Iomraidhean Croise  

Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel.


N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà:


Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.


Ma obodo nile nke ndi Livai, ulo nile nke obodo nile nke ihe-onwunwe-ha, ike nb͕aputa ebighi-ebi ka ndi Livai gēnwe.


Ndi bara uba ka i gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà; agēnye nwoke ọ bula ala-nketa-ya, dika ndi-ya agukọtara agukọta si di.


Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan