Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 35:25 - Bible Nso

25 nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n'obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Nzukọ aghaghị ichekwa onye e boro ebubo na o gburu mmadụ site nʼaka onye na-agwachite ọchụ, zilaga onye ahụ e boro ebubo nʼobodo mgbaba, bụ ebe ha gbalagara. Onye ahụ e boro ebubo ga-anọgide nʼobodo mgbaba ahụ tutu ruo mgbe onyeisi nchụaja nwụrụ, bụ onye ahụ e tere mmanụ nsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 35:25
15 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.


I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n'isi-ya, we te ya.


Ma onye-nchu-àjà n'etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n'isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya;


ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.


Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ.


nzukọm gēkpe kwa n'etiti oti-ihe ahu na onye-ọ́bọ̀ ọbara dika ikpé ndia si di:


Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n'ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara;


n'ihi na nime obodo nb͕abà ya ka o gēbi rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà: ma mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà gasiri ob͕u-madu ahu gālaghachi n'ala ihe-onwunwe-ya.


O gēbi kwa n'obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n'iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n'obodo-ya, ba kwa n'ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n'ebe ahu b͕alaga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan