Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 35:22 - Bible Nso

22 Ma ọ buru na ọ bu na mberede ka ọ kwaturu ya, mb͕e ọ nādighi n'iro, ma-ọbu tua ya ihe ọ bula, mb͕e ọ nēcheghi anwu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ ebughị iro nʼobi nutuo mmadụ ibe ya na mberede, maọbụ tụọ ya ihe,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 35:22
8 Iomraidhean Croise  

Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n'aka-ya; M'gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga.


unu gārọputa-kwa-ra onwe-unu obodo ufọdu, obodo nb͕aba ka ha gāburu unu; ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.


Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n'ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;


ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n'iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya.


ma-ọbu asi na o were nkume ọ bula, bú nke gēme ka madu nwua, me ka ọ dakwasi ya, mb͕e ọ nāhughi ya, o we nwua, ma onye ahu abughi onye-iro-ya, ọ bughi kwa onye nāchọ ime ya ihe ọjọ:


dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n'oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n'osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n'otù nime obodo ndia, we di ndu:


ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm nāmaghi ama we b͕alaga n'ebe ahu: ha gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà ipu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara.


Ma mb͕e onye-ọ́bọ̀ ọbara gāchu ya n'azu, ha agaghi ekwe ka ob͕u-madu ahu ba n'aka-ya; n'ihi na ọ bu n'amaghi-ama ka o tib͕uru madu-ibe-ya, ma ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan