Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 35:12 - Bible Nso

12 Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n'aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Obodo ndị a ga-abụ ebe mgbaba nye onye na-ezere ndụ site nʼaka onye ahụ chọrọ ịbọrọ ọbọ, ka a ghara igbu onye e boro ebubo igbu mmadụ tutu ruo mgbe e buru ụzọ kpee ya ikpe nʼihu ọgbakọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 35:12
10 Iomraidhean Croise  

Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.


Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu.


Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.


Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n'ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;


ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.


Gwa umu Israel okwu, si, Wezugara onwe-unu obodo nb͕abà ahu, nke M'gwara unu okwu bayere ha n'aka Moses:


Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan