21 Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.
21 Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.
N'ebe ahu ka ọ nọ, bú Benjamin di ntà, nke nwere ike n'aru ha, Ya na ndi-isi Juda na ìgwè ndi-ha, Na ndi-isi Zebulum, na ndi-isi Naftali.
Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.
O kwuru ihe bayere Benjamin, si, Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya; O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.