Ma ọ buru na unu anapughi n'aka ndi bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n'anya-unu, ghọ kwa ogwu n'akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n'ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya.
Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.