Ọnụọgụgụ 33:53 - Bible Nso53 Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n'ihi na ọ bu unu ka M'nyeworo ala ahu inweta ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a53 Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya. Faic an caibideil |
N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.
ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya.