41 Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.
41 Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu.
Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.
Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.