Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 33:4 - Bible Nso

4 mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 33:4
8 Iomraidhean Croise  

O tib͕u-kwa-ra umu nile eburu uzọ mu n'ala-ha, Bú nkpuru mbu nke ume-ha nile.


M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.


Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.


Ibu eboro Ijipt. Le, n'igwe-oji nke nāb͕a ọsọ ka Jehova nānọkwasi dika inyinya, O we bia rue Ijipt: ihe-efu nile nke Ijipt gēme kwa nkpatu n'iru Ya, obi Ijipt gālọ kwa ya miri n'etiti ya.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan