Umu Israel nile we tamue ntamu megide Moses, megide kwa Eron: nzukọ ahu nile we si ha, Ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo n'ala Ijipt, ma-ọbu n'ọzara nka! ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo!
ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon: