Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 32:6 - Bible Nso

6 Moses we si umu Gad na umu Reuben, Umu-nne-unu, hà gābà n'agha ahu, unu onwe-unu ewe nọdu n'ebe a?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 32:6
6 Iomraidhean Croise  

Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.


Ha si kwa, Ọ buru na ayi ahutawo amara n'iru gi, ka enye ndi-orù-gi ala nka ibu ihe-onwunwe; emela ka ayi gabiga Jọdan.


Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n'ala ahu Jehova nyeworo ha?


ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya;


unu nile n'otù n'otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n'otù n'otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya.


N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi, Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu? Na miri-iyi nile nke Reuben Ka oké nnyocha obi di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan