N'arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n'Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim,
Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n'ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya.
Nke diri Moab. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ahuhu diri Nebo! n'ihi na emebiwo ya; emewo ka ihere me Kiriataim, ewerewo ya: emewo ka ihere me Misgab, ọ nātu kwa ujọ.
Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.
n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,