N'ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n'ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri.
Gideon we rigo n'uzọ ndi bi n'ulo-ikwū n'Iru-anyanwu Noba na Jọgbeha, o tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na ọmuma-ulo-ikwū ahu nọ na ntukwasi-obi na ihe agaghi-eme ha.