Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n'ọzara, si, na M'gaghi-eme ka ha ba n'ala ahu nke M'nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile;
Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha?
n'ọzara nka ka ozu-unu ga-ada; ndi-unu nile agukọtara agukọta, dika ọnu-ogugu nile unu si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ndi tamuworo ntamu megidem,