Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 31:8 - Bible Nso

8 Ndi-eze Midian ka ha b͕u-kwa-ra, tiyere ndi-ha eb͕uru eb͕u; bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, eze ise Midian: ha were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 31:8
21 Iomraidhean Croise  

Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère.


Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha.


Onye-ozi nke nēmebi iwu nādabà n'ihe ọjọ: Ma ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi bu ihe nāgwọ madu.


N'okpuru ajọ ihe ka m'huworo ulo-ikwū nile nke Kushan: Ákwà-nkwuba nile nke ala Midian nāma jijiji.


Belam we si Chineke, Belak nwa Zipoa, bú eze Moab, eziteworom ozi, si,


Moab we si ndi-okenye Midian, Ub͕u a nkpọkọta nka gārachapu ihe nile nke di ayi buruburu, dika ehi nārachapu akwukwọ ndu nke ọhia. Belak nwa Zipoa bu kwa eze Moab na mb͕e ahu.


Ọ we zigara Belam nwa Beoa ndi-ozi, rue Petoa, nke di n'akuku Osimiri, bú ala nke umu ndi-ya, ikpọ ya, si, Le, otù ndi esiwo n'Ijipt puta: le, ha ekpuchiwo iru ala, ndi ahu nānọ kwa na ncherita-irum:


Ònye gutaworo ájá Jekob, Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel? Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi, Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!


Ma ub͕u a, le, anamalakuru ndim: bia, m'gādu gi ọdu ihe ndi nka gēme ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Belam we bilie, je, laghachi n'ebe-ya; ọzọ kwa, Belak jere n'uzọ-ya.


Aha nwayi Midian ahu nke etib͕uru etib͕u bu Kọzbi, nwa Zua; onye-isi mba nke otù ulo nna na Midian ka ọ bu.


n'ihi na ha nākpab͕u unu n'aghughọ nile ha, nke ha ji ghọb͕u unu n'okwu Peoa, na n'okwu kọzbi, bú nwa-nwayi onye-isi Midian, nwa-nne-ha nwayi, nke etib͕uru n'ubọchi ihe-otiti ahu n'okwu Peoa.


Le, ndia buru umu Israel, n'okwu-ọnu Belam, ihe nēweta nmekpu megide Jehova n'okwu Peoa, ihe-otiti ahu we di n'etiti nzukọ Jehova.


Umu Israel we dọta ndinyom Midian na umu-ntakiri-ha n'agha; ọ bu kwa anu-ulo-ha nile, na anumanu-ha nile, na àkù-ha nile, ka ha lutara n'agha.


ha rapuru uzọ guzosiri ike eguzo, we jehie, ebe ha soro uzọ Belam nwa nke Beoa, onye huru ugwọ-ọlu nke ajọ omume n'anya;


Ahuhu gādiri ha, n'ihi na ha gara n'uzọ Ken, wusì kwa onwe-ha dika miri na njehie nke Belam n'ihi ugwọ-ọlu, we la n'iyì na nkwugide nke Kora.


Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:


Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan