Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 31:6 - Bible Nso

6 Moses we ziga ha, nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula, isoro usu-ndi-agha, ha na Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, isoro usu-ndi-agha, ihe nile nke ebe nsọ Chineke na opì abua ọ gāfù idasi uda ike di kwa n'aka-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 31:6
17 Iomraidhean Croise  

Uraia we si Devid, Ib͕e Chineke, na Israel, na Juda, nānọdu n'ulo-ntu; onye-nwem Joab na ndi-orù onye-nwem nānọ kwa n'ulo-ikwū n'ọhia; ma mu onwem, m'gābà n'ulom, iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu, na isoro nwunyem dina? ndu-gi, na ndu nkpuru-obi-gi, ma ọ buru na emem ihe a.


nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:


Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.


Ma ha were npako rigorue elu ugwu ahu: ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na Moses, esighi n'etiti ọmuma-ulo-ikwū pua.


Ewe si n'usu nnù abua na ọgu iri nile nke Israel rara nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula nye, orú nnù na nnù iri ejikere iso usu-ndi-agha ahu.


O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu,


Umu Israel we ziga Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ijekuru umu Reuben, na ijekuru umu Gad, na ijekuru nkera ebo Manase, rue ala Gilead;


Sọl we si Ahaija, Bute ib͕e Chineke nso. N'ihi na ib͕e Chineke di n'etiti umu Israel n'ubọchi ahu.


Devid we mara na ọ bu ya ka Sọl nēcheputa ihe ọjọ megide; o we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, Chita ephod nso.


Onye ahu nke nēzì ozi ahu we za, si, Israel ab͕alagawo n'iru ndi Filistia, ọzọ kwa, oké ntib͕u adiwo n'etiti ndi Israel, ọzọ kwa, umu-gi ndikom abua, bú Họfnai na Finehas, anwuwo, ewerewo kwa ib͕e Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan