Ha we chiri anu-ulo-ha n'agha: camel-ha orú nnù uzọ isi na nnù ise, na ìgwè ewu na aturu orú nnù orú uzọ na uzọ iri-na-otù na nnù ise, na inyinya-ibu nnù ise, na madu orú nnù uzọ iri-na-abua na nnù iri.
Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise:
nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.