Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 31:3 - Bible Nso

3 Moses we gwa ndi Israel okwu, si, Sinu n'etiti onwe-unu jikere n'onwe-unu ndikom isoro usu-ndi-agha, ka ha we megide Midian, ibọkwasi Midian ọ́bọ̀ Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 31:3
12 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.


I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M'we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n'aka Jezebel.


ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ.


Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.


Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.


Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, emewo ka ọnumam si n'aru umu Israel laghachi, n'iwere ekworom kwo ekworo n'etiti ha, M'we ghara ime ka umu Israel gwusia n'ekworom.


ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.


Nnù ndikom abua na ọgu iri n'ebo n'ebo, n'ebo nile nke Israel, ka unu gēzigara usu-ndi-gha ahu.


N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel, N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha, Gọzienu Jehova.


Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri, Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku; N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka, Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan