22 otú ọ di, ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla, na ígwè, na b͕amb͕am, na opù,
22 Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu,
Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama.
Anēsi n'ájá eweputa ígwè, Anāwu kwa nkume ighọ ọla.
Moses, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nile nke nzukọ Israel, we pua izute ha n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si ndikom nke usu-ndi-agha ahu ndi nābà n'agha ahu, Nka bu ukpuru iwu ahu nke Jehova nyere Moses n'iwu:
bú ihe ọ bula nke gānagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga n'ọku ọ gādi kwa ọcha; nání, agēwere miri nke idi-na-nsọ wepu nmehie-ya: ma ihe ọ bula nke nāgaghi-anagide ọku, unu gēme ka ọ gabiga nime miri.
Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.
Nání na Israel lutara n'onwe-ha anu-ulo na ihe-nkwata nke obodo ahu n'agha, dika okwu Jehova si di nke O nyere Joshua n'iwu.