Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 31:2 - Bible Nso

2 Bọrọ umu Israel ọ́bọ̀ n'aru ndi Mdian: emesia agāchikọta gi na umu-nna-gi n'ala-mọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 31:2
30 Iomraidhean Croise  

Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.


Ma ndia bu arọ nke ndu Ishmael, ọgu arọ isi na iri na asa: ọ we kubie ume, nwua; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.


Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.


Ma onye-nchu-àjà Midian nwere umu-ndinyom asa: ha we bia, se miri, b͕aju ebe anētiye miri ime ka ìgwè ewu na aturu nke nna-ha ṅua.


N'ihi nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta,) A, M'ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M'gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom:


Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n'aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu.


Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.


i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ, ọ gānwu kwa n'ebe ahu.


Israel we biri na Shitim, ndi Israel we malite isoro umu-ndinyom Moab nākwa iko:


Ma, le, otù nwoke nime umu Israel biara, weta nso umu-nne-ya otù nwayi Midian n'anya Moses, na n'anya nzukọ nile nke umu Israel, mb͕e ha onwe ha nākwa ákwá n'ọnu-uzọ ulo-kwū nzute.


Ma mb͕e i huworo ya, agāchikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ, ọbuná gi onwe-gi, dika achikọtara Eron, bú nwa-nne-gi na umu-nna-ya:


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Moses we gwa ndi Israel okwu, si, Sinu n'etiti onwe-unu jikere n'onwe-unu ndikom isoro usu-ndi-agha, ka ha we megide Midian, ibọkwasi Midian ọ́bọ̀ Jehova.


N'ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu.


N'ihi na Devid, mb͕e o jesiri ọb͕ọ-ya ozi, o sitere n'ìzù Chineke da n'ura ọnwu, ewe tọb͕ọ ya n'ebe nna-ya-hà nọ, o we hu ire-uré:


Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.


n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.


Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.


ma mu onwem gaje inwu n'ala nka, adighm-agabiga Jọdan: ma unu onwe-unu nāgabiga, unu gēnweta kwa ezi ala ahu.


ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.


N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


n'ihi na ikpé-Ya nile bu ezi-okwu buru kwa ikpé ziri ezi; n'ihi na O kpere oké nwanyi ahu nākwa iko ikpé, bú nwanyi nke were ikwa-iko-ya mebie uwa, Ọ bọ̀-kwa-ra ọ́bọ̀ ọbara ndi-orù-Ya n'isi-ya.


ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?


Ndi ahu we hu ya, to chi-ha: n'ihi na ha siri, Chi-ayi enyewo onye-iro-ayi n'aka-ayi, bú onye nēme ka ala-ayi tọb͕ọrọ n'efu, onye me-kwa-ra ka ndi-ayi eb͕uru eb͕u ba uba.


Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan