b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.
Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia.
nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.
Joshua we tib͕ue ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb, na ebe di ala ala, na nkpọrube nile, na eze-ha nile; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o wezuga ihe nile nēku ume ka ebibie ya, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere iwu.
Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n'agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu.
Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.