Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 31:14 - Bible Nso

14 Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 31:14
13 Iomraidhean Croise  

Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha.


Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.


Onye nke Chineke ahu we wesa ya iwe, si, Asi na i tiri ub͕ò ise ma-ọbu ub͕ò isi; mb͕e ahu i gēti Siria rue mb͕e i gēme ka ọ gwusia: ma ub͕u a i gēti Siria nání ub͕ò atọ.


O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n'aka-ya, tupia ha n'okpuru ugwu ahu.


Eron we si, Ka iwe onye-nwem ghara idi ọku: gi onwe-gi amawo ndi nka, na ọ bu nime ihe ọjọ ka ha nọ.


Moses we chọsie nkpi nke àjà-nmehie ike, ma, le, esurewo ya ọku: ọ we iwe n'aru Eleeza na n'aru Itama, bú umu-ndikom Eron fọduru, si,


Ma nwoke ahu, bú Moses, di ume-ala n'obi nke-uku, kari madu nile ndi nọ n'elu ala.


Moses, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nile nke nzukọ Israel, we pua izute ha n'azu ọmuma-ulo-ikwū.


Moss we si ha, Ùnu emewo ka ndinyom nile di ndu?


Ndi-nlekọta ndi nēlekọta usu nile nke nnù ndikom nke usu-ndi-agha abua na ọgu iri, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, we bia nso Moses:


Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu:


o gēdo-kwa-ra ha onwe-ya ibu ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom abua na iri; na ilu ọlu-ubi-ya, na iwe ihe-ubi-ya, na ikpu ihe-agha-ya nile, na ihe nile nke ub͕ọ-ala-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan