Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 30:8 - Bible Nso

8 Ma ọ buru na di-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ gēmebi kwa nkwa-ya nke dikwasi ya, na okwu efu ahu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya, nke o ji ke nkpuru-obi-ya: Jehova gāb͕aghara kwa ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma ọ bụrụ na di ya ajụ ịnabata nkwa ahụ, maọbụ ọṅụṅụ iyi nzuzu ahụ, ọjụjụ di ya jụrụ nkwa ahụ ga-eme ka iyi ahụ maọbụ nkwa ahụ ghara ịdị ire. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 30:8
10 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi.


Ma mb͕e ayi onwe-ayi nēsurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāwusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bu mb͕e di-ayi nēkweghi ka ayi meworo ob͕e achicha nye ya ime onyinyo-ya, wusi-kwa-ra ya àjà-ihe-ọṅuṅu?


ma-ọbu mb͕e madu gāṅu iyi, nēwere eb͕ub͕ere-ọnu-ya kwu okwu efu ime ihe ọjọ, ma-ọbu ime ezi ihe, ọbuná okwu efu ọ bula madu nēkwu n'iṅu iyi, ma ezonariri ya; mb͕e ya onwe-ya mara, ikpe gāma kwa ya bayere otù nime ihe ndia:


Ma ọ buru na nna-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ dighi ihe ọ bula nime nkwa-ya nile, ma-ọbu nime isọ-nsọ-ya nile nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi ike: Jehova gab͕aghara kwa ya, n'ihi na nna-ya si ya, É-è.


di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti n'ubọchi ọ nuru ya: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ nile, nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi kwa ike.


Ma nkwa nke nwayi di-ya nwuru, ma-ọbu nke nwayi achupuru achupu, bú ihe ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, o gēguzosi ike megide ya.


Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.


Ọ bughi nwunye nāchi aru nke onwe-ya, kama ọ bu di-ya: otú a kwa ọ bughi di nāchi kwa aru nke onwe-ya, kama ọ bu nwunye-ya.


Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan