Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 3:9 - Bible Nso

9 I gēwere kwa ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom: ndi enyesiworo aha ha nile site n'etiti umu Israel ka ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 3:9
15 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;


Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;


Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.


site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n'aha n'aha.


Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi;


Ọzọ kwa, umu-nne-gi, bú ebo Livai, ebo nna-gi, gi me ka ha soro gi biaru nso, ka ha we rapara n'aru-gi, nēje-kwa-ra gi ozi: ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gānọ n'iru ulo-ikwū ihe àmàm.


Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.


I gēkewaputa kwa ndi Livai n'etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere.


N'ihi na ndi enyesiworom ha nile ka ha bu site n'etiti umu Israel; n'ọnọdu umu nile ọ bula meghere àkpà-nwa, bú umu eburu uzọ muru madu nile nke umu Israel, ka M'wereworo ha n'Onwem.


Ewerewokwam ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel.


Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm.


Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;


N'ihi nka Ọ si, Mb͕e Ọ rigoro n'elu, Ọ dọtara usu ndi adọtara n'agha n'agha, Nye kwa madu onyinye di iche iche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan