Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 3:6 - Bible Nso

6 Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n'iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 3:6
18 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi na ebe-nguzo-ha di n'akuku umu Eron ifè òfùfè ulo Jehova, n'ogige nile, na n'ime-ulo nile, na n'ime ka ihe nsọ ọ bula di ọcha, bú ọlu òfùfè ulo Chineke;


ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.


Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;


Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ha we guzo ndi-nchu-àjà nime nkewa-ha, na ndi Livai n'òkè-ha, bayere òfùfè Chineke, nke di na Jerusalem; dika edere ya n'akwukwọ Moses.


Unu ewe mara na eziteworom unu ihe a enyere n'iwu, ka ọḅuḅa-ndum we diyere Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.


Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n'etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n'akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di.


Ma agukọtaghi ndi Livai n'etiti umu Israel; dika Jehova nyere Moses iwu


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan