Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọnụọgụgụ 3:38 - Bible Nso

38 Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'iru ebe obibi ahu chere iru n'Iru-anyanwu, n'iru ulo-ikwū nzute chere iru n'ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

38 Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom. Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile. Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọnụọgụgụ 3:38
12 Iomraidhean Croise  

ka ha we debe kwa ihe-ndebe ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe ebe nsọ ahu, na ihe-ndebe umu Eron, bú umu-nne-ha, bayere òfùfè ulo Jehova.


Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu.


Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku. Iru-anyanwu chere iru n'ọwuwa-anyanwu bu ndi nke ọkọlọtọ ọmuma-ulo-i kwū Juda, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: onye-isi umu Juda nwere bu Nahshon nwa Aminadab.


I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu.


Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.


Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu.


na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan